Ihu mbụ
Igwe Kenneth Onyeneke Nwafor Orizu III (a mụrụ ya na afo otu puku na nari iteghete na iri na ise), nke no n'etiti n'foto egosiputara n'aka nri bụ Obi nke Otolo na Igwe nke ọchịchị Nnewi nke iri abụọ . Ọ bụ onye isi ọdịnala na onye ndu ime mmụọ na Nnewi, obodo ndị Igbo na Naijiria. Ọ bụ onye so na usoro ọmụmụ Nnofo Royal na onye nọchiri nna ya Igwe Josiah Orizu II, nna nna ya bụ Igwe Orizu I, na nna nna nna ya bụ Igwe Iwuchukwu Ezeifekaibeya. N’adịghị ka ọtụtụ alaeze ndị Igbo, e nwere ndị eze Nnewi tupu mbata ndị Ocha. Na steeti Anambra, Igwe Kenneth Orizu nke Atọ bụ osote onye isi oche nke Steeti Anambra nke Ndị Isi nke Steeti Anambra na afo puku abu na iri na ise dika ọnye kachasị eze niile na Naijiria. ...Gaa n'ihu ịgụ édémédé àMmanwụ bụ ihe ọdịnala nke ndị Igbo nke Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Ọ bụ naanị ụmụ nwoke na-eme ha n'ime òtù nzuzo pụrụ iche ma na-agụnye iji ejiji dị iche iche, mara mma nke e bu n'uche ịkpọtụrụ mmụọ ndị nna nna. Omenala mmawu nwere ebumnuche dịgasị iche iche nke sitere na ịme ihe nkiri ige ocie sitere na cosmology na akụkọ ihe mere eme nke obodo, na-ewebata ọnwa na oge ọhụrụ, na-asọpụrụ totems na mmụọ ndị nna nna, mmepụta nke ilu ma ọ bụ akụkọ ifo, na ntụrụndụ na iwu obodo na-eje ozi dị ka ihe jikọrọ ọnụ. N'oge gara aga, mmawu nwekwara ikike ikpe, nchịkwa mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na ọbụna ikike ndị uwe ojii, ọ bụ ezie na ọrụ ndị a belatara n'oge a. Lee fòtó ndị ọzọ na Commons.Ọ bụrụ na ị nwèrè Árò, édémédé, mà ọ bụ foto ị choro kà egosi na peeji à, biko depụta ha ebe à.
Ị nwèrè árò, édémédé mà ọ bụ foto ị chọrọ ka egosi n'ihụ mbụ à, biko gbaa mbò ka ị depụta, kọwaa na tinye njikọ há na peeji ákụkọ à |
|